Main Article Content

Ọrụ Agụmagụ Ọnụ Nye Nkuzi Na Nkwalite Obibi Ndụ Ndị Igbo


Nwaoke, Emmanuel Emeka
Eze Adaora Maudline
Nwaoke, Queendaline Chinwendu

Abstract

Nchọcha a lebara anya na ọrụ agụmagụọnụ nye nkuzi na nkwalite obibi ndụndị Igbo. Mbunuche nchọcha a bụ ịkọwapụta agụmagụ ọnụ dị ka ụzọ e si akụzi ma na-akwalite usoro obibi ndụ ndị Igbo. Agụmagụ ọnụ Igbo bụ nke obodo na-enwekodo ọnụ n’ihi na o nweghi onye a ma dị ka onye nwe nke ọ bụla kpọmkwem. Ọ bụ ọnọdụ a mere o ji adị mfe inweta nkwugharị otu akụkọ n’ọnụmara dị iche iche n’ala Igbo.Nchọcha a bụ nke ndịzima; nchọcha seere ma tụchaa njatụle e ji mee nchọcha a site na nleru anya nakwa n’ịtụle ihe nchọcha ndịọzọ merela banyere isi okwu a. A na-esite n’emereme ọdịnala wube agụmagụ ọnụ; ọ bụ nke a mere e ji akpọkwa ya agụmagụ ọdịnala.Ọzọ, tupu ọbịbịa mbịarachịwa, e nwere agụmagụ Igbo nke e detughi edetu. Agụmagụ ọdịnala Igbo na-esite n’emereme akụzi nkwanye ugwu, mmekọrịta, onye aghana nwanne ya, nkwalite ndụ, na nkwalite udo na ọdịmma ezinaụlọ nakwa nke obodo.  A chọpụtara na ọ dị mkpa iji agụmagụ ọnụ kuziere ndị mmadụ nkwenye, omenala na ụkpụrụ ndị na-akwalite ezi mmekọrịta na obibindụ n’ala Igbo. Ọzọ, agụmagụ ugbu a nke a na-ezipụta n’ụdị ederede bụ nke na-enweta ike ekereuche ya site n’akụkọ ọdịnala. E kwesiri ichekwaba agụmagụ ọdịnala n’ụdị ederede, na/ma ọ bụ okwu (ma ọ bụ onyonyo) a dọọrọ adọrọ. Mgbe e mere nke a, ha ga-abụ ụzọ mkpali mmụọ nye ụmụaka ịmata ụfọdụ ihe merela tupu a mụọ ha ma marakwa ihe nkuzi, ihe nrite na ntaram ahụhụ na-eso omume ụfọdụ. Ndị na-ahụ maka agụmakwụkwọ/mmụta nke ụdị kwesikwara itinye nke a na kurikulum.


Journal Identifiers


eISSN: 2787-0359
print ISSN: 2787-0367