Main Article Content

Nsogbu Nwaanyi Ajadu N'ala Igbo


Eze, Adaora Mauldine
Medolu, Agatha Ọbịageli
Chioma Magdaline Akaeze

Abstract

Ọnwụ bụ ihe a na-ahụta dịka ihe oke mwute n'omenala Igbo. Nchọcha a ga-agbado ụkwụ na nsogbu nke a na-enye nwaanyịna mpaghara ụfọdụ n'ala Igbo ngwa ngwa di ya lara mmụọ. Ụmụ nwaanyị ndị a na-agabiga ọtụtụ mmekpa ahụ n'ụzọ dị iche iche.  Oge nwoke nwụrụ, nwunye ya na-eru ụjụ ọnwụ di ya. Ọ na-atụ anya na ndị mmadụ karịsịa ndị ikwu na ibe ya ga-enwe ọmịiko, agbamume, nkwụdo,ịhụnanya, mkpachapụ anya na nkwado nye ya. Ma ọtụtụ oge, ọ naghị enweta nke a.  Mbunuche nchọcha a bụ ka ewepụta ụzọ dị iche iche e si enye nwaanyị ajadu mmekpa ahụ ndị a ma nwee ụzọ mgbapụ nye ajọ mmeso nke a na-emeso ụmụ nwaanyị ajadu ndị a. Nchocha a bu nchocha ndizimma. Atụtụ a ga-agbaso mee nchọcha a bụ atụtụ mmekọrịta ọha nke Seidman (2010) wepụtara. A na-atụ anya na site na nchọcha a, a ga-enwe nchegharị echiche nye mmegide a dị iche iche. Site na nke a, a ga-enwe ezi ikpe nkwụmọtọ na oké nhatanha nye nwaanyị ajadu ọbụla n'ala Igbo. Nchọcha a ga-eme ka e nwee ezi nleta anya nye nwaanyị ajadu ọbụla n'ala Igbo bụ nke a ga-eme ka ọ gbasa n'ala Igbo niile nakwa mba ụwa dum. Site n'ụzọ dị otu a, a ga-enwe ezi ihe mgbanwe banyere ọnọdụ a.


Journal Identifiers


eISSN: 2787-0359
print ISSN: 2787-0367