Main Article Content

Mbịakọ Asụsụ na Mgbanwe Asụsụ n’Ẹdda


Onu M. Agha
Egwu R.O. Uka
Ngozi Emeka-Nwobia
Obianika C. Evelyn
Eze A. Maudline
Ekwe M. Ayaru

Abstract

Mbịakọ ma ọ bụ mmekọrịta asụsụ bụ mgbe asụsụ abụọ ma ọ bụ kaịrịa nwere mmekọrịta. Ya bụ mgbe
ọ bụla ndị na-asụ asụsụ dị iche iche bịakọrọ ọnụ ma ọ bụ nwere mmekọrịta, asụsụ ha na-emetụta
onwe ha. Asụsụ nke ọ bụla nwere ike imetụta nke ọzọ n’ebe ọ pụrụ iche nke na o nwere ike iweghara
ọnọdụ nke ọzọ ma ọ bụ mee ka e nwee mgbanwe n’ebe ụfọdụ. Mgbe e nwere mbịakọ asụsụ, asụsụ
ndị ahụ bịakọrọ nwere ike ịmakọ, gbaziri okwu ma ọ bụ nwee mgbanwe na ụfọdụ mkpụrụ okwu ha.
Nchọcha a chọrọ ịma ma mbịakọ olu ndị Ẹdda bịakọrọ n’olu Igbo ndị ọzọ nwere out o siri wete
mgbanwe olu ndị ahụ. Kpọmkwem, mbunuche nchọcha a bụ ịmata ụdị mgbanwe ndị pụtara ihe n’olu
ndị Ẹdda. Nchọcha a gbasoro usoro sosholingwisitik langueji kọntakiti. A chọpụtara na dị ka olu ndị
Ẹdda na asụsụ ndị Igbo ndị ọzọ na abịakọ na-enwe mmetụta olu asụsụ ahụ na-agbanwe. Ihe ndị naebute mgbanwe ahụ gụnyere mbịakọ asụsụ, mmekọrịta, nlụkọrịta di na nwunye na ebe onye bi dg. A
chọpụtakwara na mgbanwe a na-ahụta n’olu ndị Ẹdda enweghị usoro, ma ndị bi n’ime obodo, ma ndị
bi n’ụzọ ije socha na mgbanwe a. Otu aka ahụ kwa mgbanwe a kacha pụta ihe n’etiti ụmụ na-eto eto.
Ụdị mgbanwe achọpụtara n’olu ndị Ẹdda gunyere; mgbanwe nke ụda, mgbanwe nke ọdịdị, mgbanwe
nke nsirmmebe, mgbanwe nke usoro okwu na mgbanwe nke echiche. Ndị nchọcha tụnyere aro ndị a:
ka ndị nkuzi gbalịsie ike tinye n’ọrụ ihe “Policy on Education” kwuru maka iji asụsụ epum akụziri
ụmụ aka ihe n’ogugo mbido agụmakwụkwọ. Ezinaụlọ, dị ka ebe mmụta na-ebido, ga-agbalịsie ike
kụnye n’ime ụmụ aka inwe mmasị na ugwu nye asụsụ ha n’ihi na ọ bụrụ na ha nwee mmasị na ugwu
nwe asụsụ ha, ha ga-achọ ịsụ ya mgbe niile. Ndị ọchịchị wepụta otu ụbọchị ma ọ bụ abụọ a ga-akpọ
“Igbo ga-adị”, a ga-eji na-asụ naanị Igbo onweghi asụsụ ọzọ a ga-anabata n’ụbọchị ahụ n’ụlọ ọrụ
nakwa ebe ndị ọzọ.


Journal Identifiers


eISSN: 2787-0359
print ISSN: 2787-0367